Ofufe (Praise) for Nne Agwu (i)
Nne’m Omumu Ekene’m
My mother of all creative and attracting energies I greet you
Nne Okpu Nne Mmiri
Primordial mother, Mother of all waters
Ada Ada Ada
Primodial first daughter
Anwu Anwu Anwu
The first light of the universe
Agwu Agwu Agwu
Infinite spirit
Chi kasi Chi niile
Chi (spirit) greater that every Chi (spirit) that exists
Eke mulu Eke niile ekele’m gi
Eke (matter) that births all Eke (matter) I greet you
Akpo Azaa
One who answers when called
Agbara Nwanyi
Divine mother
Odogwu mulu Agu
Great one that births great ones
Lolo mulu lolo
Queen of queens
Eze mulu Eze
Priest of priests
Mmuo Afa Ekele’m
Spirit of divination I greet
Mmiri welu Mmiri niile
Primordial water that owns all waters
Oshimmiri Ataata
Ocean that never drys up
Ara na enye uwa niile nni
The breast that gives food to the whole world
Nne na mulu umu uwa mmuo na mmadu zuo ha niile
Mother that gives birth to children of the spirit world as well as the world of man and raises them all
Omamma na ama mma
Ultimate doer and giver of good
Om di n’ime Omimi
The first sound and frequency in all things
Ora muru Ora odii
World that births infinite worlds
Ogwugwu na adighi agwu agwu
Supreme mother of all things who has no end
Nne Iyi ekele diri gi
Mother of justice praises to you
Mmuo Nso na edebe nso uwa niile
Holy spirit that bears the burden of the whole world
Ofoooo
May your authority be established.